Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 7:6 - Bible Nso

6 Jehova chèghariri uche bayere nka: Nka agaghi-adi kwa, ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 7:6
16 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, M'gēkpochapu madu n'elu ala, bú ndi M'keworo; ma madu, ma anu-ulo, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: n'ihi na echeghariwom na emerem ha.


Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.


O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha, We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.


N'ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe, Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya.


Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha: E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu, Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.


Lata, Jehova; rùe ole mb͕e? Chèghari kwa obi-Gi bayere ndi-orù-Gi.


Jehova we chegharia uche bayere ihe ọjọ nke O kwuru, si na Ọ gēme ndi-Ya.


Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.


Ọ buru na unu ebiri n'ala nka, M'gēwu kwa unu dika ulo, ghara ikwada unu, M'gāku kwa unu dika osisi, ghara iropu unu: n'ihi na echeghariwom n'ihe ọjọ ahu nke M'meworo unu.


dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta.


Jehova chèghariri uche bayere nka: Ọ gaghi-adi, ka Jehova siri.


Otú a ka O mere ka m'hu: ma, le, Onye-nwe-ayi nēguzo Onwe-ya n'akuku mb͕idi ejiri opù eji atù mb͕idi lua, ọ bu kwa n'aka-Ya ka opù eji atù mb͕idi di.


Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.


O we kpere Jehova, si, Biko, Jehova, Ǹka abughi okwum, mb͕e m'nānọ n'alam? N'ihi nka ka m'buru uzọ b͕alaga na Tashish: n'ihi na amaram na Gi onwe-gi bu Chineke nke bu onye-amara, onye-obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ Nke nāba kwa uba n'ebere, Nke nēchèghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu I gēweta.


Ha we si n'etiti ha wezuga chi ala ọzọ nile, fè Jehova òfùfè: nkpuru-obi-Ya enweghi kwa ntachi-obi n'ihi ọnọdu ọjọ nke Israel.


Ma mb͕e Jehova mere ka ndi-ikpe biliere ha, Jehova nọye-kwara-ra onye-ikpe ahu, we zọputa ha n'aka ndi-iro-ha ubọchi nile nke onye-ikpe ahu: n'ihi na Jehova cheghariri uche n'ihi isu-ude-ha n'iru ndi nēmeb͕u ha nākpab͕u kwa ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan