Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 7:2 - Bible Nso

2 O rue, mb͕e ha ripiasiri ihe-ọkukú nile nke ala, na m'siri, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, b͕aghara: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Mgbe ha tachara ahịhịa niile dị nʼala ahụ, etiri m mkpu: “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko arịọọ m gị, gbaghara. Jekọb ọ ga-esi aṅa guzosie ike? Lee, ọ dịkarịrị nta.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 7:2
20 Iomraidhean Croise  

Jehova, zọputa; n'ihi na onye-ebere agwusiwo; N'ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n'etiti umu madu.


Ha we kpuchie iru ala ahu nile, ala we b͕a ọchichiri; ha we rie ihe-ọkukú nile ọ bula nke ala ahu, na nkpuru nile nke osisi nke ákú-miri-ígwé rapuru: ọ dighi kwa akwukwọ ndu fọduru, n'osisi ma-ọbu n'ihe-ọkukú nke ubi, n'ala Ijipt nile.


Ọ si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Onye-nwe-ayi, biko, ka Onye-nwe-ayi nēje n'etiti ayi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka ayi bu; Gi b͕aghara kwa ajọ omume-ayi na nmehie-ayi, keta kwa ayi n'ihe-nketa.


Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya Ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: gi buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo.


Ihe abua ndia adakwasiwo gi; ebere o nwere n'aru gi? nbibi na ntikpọ na oké unwu na mma-agha: M'gēsi aṅa kasie gi obi?


Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n'ihi aha-Gi, Jehova: n'ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.


si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:


O rue, mb͕e M'buru amuma, na Pelataia nwa Benaia nwuru. M'we da kpue irum n'ala, tie nkpu n'oké olu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ọ̀ bu ka ndi Israel fọduru gwusia ka Gi onwe-gi nēme?


O rue, mb͕e ha nētib͕u, ma nání mu onwem fọduru, na adaram kpue irum n'ala, tie nkpu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! Ọ̀ bu onye-nbibi nke Israel nile ndi fọduru ka I gābu mb͕e I nāwukwasi Jerusalem ọnuma-Gi?


Onye-nwe-ayi, nuru: Onye-nwe-ayi, b͕aghara: Onye-nwe-ayi, ṅa nti me ihe: anọla ọdu: n'ihi Gi onwe-gi; Chinekem, n'ihi na aha-Gi ka akpọkwasiworo obodo-Gi na ndi-Gi.


Ka ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, kwa ákwá n'etiti uzọ-nbata-Ya na ebe-ichu-àjà-Ya, si, Jehova, mere ndi-Gi ebere, arara-kwa-la ihe-nketa-Gi nye n'ita-uta, Ka mba nile ọzọ we ghara ichi ha: n'ìhi gini ka ha gāsi n'etiti ndi nile dí iche iche, Òle ebe Chineke-ha nọ?


Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, tib͕ue unu: ka ha rà, bú ubi-unu ab͕ara ogige, na ubi-vine-unu, na osisi fig unu, na osisi olive unu, palmer-worm nērichapu ha: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, rapu: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.


N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile.


Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n'egedege-iru-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan