Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 7:14 - Bible Nso

14 Emos we za, si Amazaia, Ọ dighi onye-amuma m'bu, ọ dighi kwa nwa onye-amuma m'bu; kama onye-nche-ehi ka m'bu, ya na onye nēdozi nkpuru osisi sycomore:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 7:14
17 Iomraidhean Croise  

O si n'ebe ahu je, chọta Elaisha nwa Shefat, ma onye ahu nēme ka ehi-ya dọghari ihe eji gwu ala ubi, orú ehi na anọ ejikọrọ abua abua di n'iru ya, ya onwe-ya nọye-kwa-ra ehi abua nke-iri-na-abua: Elaija we gabiga jekuru ya, wusara ya uwe-nwuda-ya.


Ma otù nwoke n'etiti umu ndi-amuma siri ibe-ya n'okwu Jehova, Biko, tiem ihe. Ma nwoke ahu juru iti ya ihe.


Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko na ncherita-iru ya we hu ya, si, Mọ Elaija anọkwasiwo Elaisha. Ha we bia izute ya, ha we kpọrọ ya isi ala.


Umu ndi-amuma ndi nọ na Bet-el we pukute Elaisha, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.


Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biarue Elaisha nso, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.


Ọgu ndikom abua na iri n'etiti umu ndi-amuma je-kwa-ra, guzo na ncherita-iru ha n'ebe di anya: ha abua we guzo n'akuku Jọdan.


Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n'ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n'iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n'ọku, siere umu ndi-amuma ofé.


Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n'iru gi adikara ayi nkpa.


Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N'ihi na i dabeworo n'eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n'aka-gi wepuga onwe-ya.


Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n'anya? ma n'ihi ihe a iwe dikwasi gi site n'iru Jehova.


Ma ihe nile Jehoshafat mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Jihu nwa Hanani, onye etiyere aha-ya n'akwukwọ ndi-eze Israel.


Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi; Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.


Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.


Ọdum ab͕ọwo uja, ọ̀ bu onye nāgaghi-atu egwu? Onye-nwe-ayi Jehova ekwuwo, ọ̀ bu onye nāgaghi-ebu amuma?


ma ọ gāsi, Ọ dighi onye-amuma m'bu, onye-ọlu-ubi ka m'bu; n'ihi na madu mere ka ab͕atam site na mb͕e m'di na nwata.


Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike;


O rue, mb͕e ndi nile ndi mara ya na mb͕e gara aga huru, ma, le, ọ nēso ndi-amuma bū amuma, ndi ahu we sirita onwe-ha, Gini bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan