Olu ìgwè madu ndi nọ n'udo di kwa nime ya: tukwasi kwa ndikom ndi sitere n'ọra madu, emewo ka ndi nāṅubiga manya ókè si n'ọzara bia; ha we tiye ọla-aka n'aka nke ndinyom ahu, na okpu-eze mara nma n'isi-ha.
Menu ka anuru ya n'elu ulo-elu nile n'Ashdod, na n'elu ulo-elu nile n'ala Ijipt, si, Zukọtanu n'elu ugwu nile nke Sameria, hu ọb͕ub͕a-aghara di ọtutu nke di n'etiti ya, na nmeb͕u di iche iche nke di nime ya.
N'ihi na amawom na ihe bara uba ka njehie-unu bu, na ihe di ike ka nmehie nile unu bu; unu ndi nākpab͕u onye ezi omume, ndi nānara ihe-nb͕aputa, ma ọ bu umu-ob͕eye di n'ọnu-uzọ-ama-unu ka unu nēwezuga n'ikpe-ha.
Inyinya, hà nāb͕a ọsọ n'elu nkume di elu? àgēji ehi dọ ihe eji gwu ala-ubi n'ebe ahu? na unu ab͕anwewo ikpé ka ọ ghọ ńsí, b͕anwe kwa nkpuru ezi omume ka ọ ghọ wormwood:
nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n'ihi na site n'ubọchi nna-ayi-hà dara n'ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè.
n'ihi na n'otù oge hour emere ka oké àkù di otú a tọb͕ọ n'efu. Ndi-isi-ub͕ọ nile n'otù n'otù, na onye ọ bula nke nēje n'ebe ọ bula n'ub͕ọ, na ndi-ub͕ọ, ka ha ra kwa, bú ndi nālu ọlu nime oké osimiri, ha guzo-kwa-ra n'ebe di anya,