Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 5:8 - Bible Nso

8 chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Onye mere kpakpando pleiades na orion, onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ, na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị, onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, wụsa ha nʼelu ala akọrọ, Onyenwe anyị bụ aha ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 5:8
23 Iomraidhean Croise  

Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi, We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.


Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya, Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.


Ì nēweli olu-gi elu rue igwe-oji, Ka njubiga miri we kpuchie gi?


Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida.


I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali; Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa.


O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile.


M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha.


Ayi nāsọghari ìsì na mb͕idi dika ndi-ìsì, e, ayi nāsọghari ìsì dika ndi nēnweghi anya: ayi asuwo ngọngọ n'etiti-ehihie dika ọ bu chi-ojiji; n'etiti ndi nwere ezi ndu ayi nọ ka ndi nwuru anwu.


N'ihi nka, le, M'gaje ime ka ha mara, na mb͕e a ka M'gēme ka ha mara akam na idi-ikem; ha gāmara kwa na aham bu Jehova.


Otú a ka Jehova, bú Onye nēme ya, Jehova, bú Onye nākpu ya ime ka o guzosie ike, Onye Jehova bu aha-Ya, siri:


N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na M'gēme ka anyanwu da n'etiti-ehihie, M'gēme kwa ka uwa b͕a ọchichiri mb͕e chi bọchara abọcha.


Onye nēwu ime-ulo-elu-Ya nile n'elu-igwe, ma mbara-ígwé-Ya, n'elu uwa ka Ọ tọworo ntọ-ala-ya; Onye nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha n'ala; Jehova bu aha-Ya.


Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiri Huru oké ìhè, Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu, Ndia ka ìhè walitere.


Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan