Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 5:27 - Bible Nso

27 M'gēme kwa ka unu je biri n'ala ọzọ n'ofè Damaskọs, ka Jehova, Onye aha-Ya bu Chineke nke usu nile nke ndi-agha, siri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ya mere, aghaghị m ime ka e buru unu gaa nʼala ndị ọzọ, nʼofe Damaskọs,” ka Onyenwe anyị, Onye ahụ aha ya bụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 5:27
10 Iomraidhean Croise  

Jehova gētib͕u kwa Israel, dika amì nēme nkpatu nime miri; Ọ gēropu kwa Israel n'ezi ala nka, nke O nyere ndi bu nna-ha, Ọ gēfesa kwa ha n'ofè Osimiri; n'ihi na ha emewo Asherim-ha, nākpasu Jehova iwe.


N'ubọchi Peka, bú eze Israel, ka Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, biara, were Ijon, na Ebel-bet-meaka, na Janoa, na Kedesh, na Hezoa, na Gilead, na Galili, bú ala nile nke Naftali; o we me ka ha je biri n'Asiria.


rue mb͕e Jehova siri n'iru Ya wezuga Israel, dika O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma. Ewe me ka Israel si n'elu ala-ha je biri n'Asiria, rue ta.


N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia.


Jeremaia we si Zedekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, siri: Ọ buru na i gāpukuru ndi-isi eze Babilon n'ezie, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu, agaghi-esure kwa obodo a n'ọku; i gādi kwa ndu, gi onwe-gi na ulo-gi:


N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.


É-è, kama unu eburuwo ulo-ikwū nke eze-unu na Kaiun, bú onyinyo-unu, bú kpakpando nke chi-unu, nke unu mere onwe-unu.


Ahuhu diri ndi nọ jū na Zaion, na ndi nwere ntukwasi-obi n'ugwu Sameria, ndi akpọrọ n'aha n'aha n'etiti isi mba nke mba nile, ndi ulo Israel biakuteworo!


N'ihi nka ub͕u a ka agēme ka ha je biri n'ala ọzọ buru ndi-obu-uzọ nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, oriri ọkwukwa-ozu nke ndi nēseti onwe-ha gēwezuga kwa onwe-ya.


Unu we palie ulo-ikwū nke Mọlọk, Na kpakpando nke chi ahu, bú Refan, Ihe-atù unu mere ikpọ isi ala nye ha: M'gēme kwa ka unu je biri n'ofè Babilon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan