Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 5:24 - Bible Nso

24 Ma ka ikpé ziri ezi nērùdasi ike dika miri, ezi omume kwa dika miri-iyi nke nērù mb͕e dum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri, ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 5:24
11 Iomraidhean Croise  

Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i ṅarari nti n'ihe nile M'nyere n'iwu! udo-gi ewe diwori ka osimiri, ezi omume-gi adi kwa ka nmali-miri nile nke oké osimiri:


Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n'aru ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi na ebere atọwom utọ, ọ bughi àjà; ọmuma Chineke atọwokwam utọ kari àjà-nsure-ọku nile.


Wezuga n'arum ùzù abù-gi nile; ọ bu kwa ọkpukpọ une-gi nile ka M'nāgaghi-anu.


unu ndi nāb͕anwe ikpé ziri ezi ka ọ ghọ wormwood, ndi nātọb͕ọ kwa ezi omume n'ala;


Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan