Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 5:22 - Bible Nso

22 N'ihi na ọ buru na unu esurerem àjà-nsure-ọku nile na onyinye-inata-iru-ọma nile unu, ha agaghi-atọm utọ: ọ bu kwa àjà-udo nke anu mara abuba nile unu ka M'nāgaghi-elegide.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu, agaghị m anabata ha. Aja udo nke anụ unu gbara abụba abụrụghị m ihe ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 5:22
19 Iomraidhean Croise  

Gi ka m'gāchuru aja ekele, Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.


Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ; Nti abua ka I ràpúworom: Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.


Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.


Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.


Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú: O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?


Jehova nāsi, N'ìhi gini ka unu nāchurum ọtutu àjà-unu? afọ ejuwom n'àjà-nsure-ọku nile eji ebulu chu, na abuba umu-ehi emere ka ha ma abuba; ọzọ, ọbara oke-ehi na nke umu-aturu na nke nkpi atọghm utọ.


Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ;


Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n'anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.


N'ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n'ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Tukwasinu àjà-nsure-ọku nile unu n'elu àjà nile unu, ri-kwa-nu anu.


Nka bu kwa iwu nke ihe àjà nke àjà-udo nke madu gēweta nso Jehova.


Wezuga n'arum ùzù abù-gi nile; ọ bu kwa ọkpukpọ une-gi nile ka M'nāgaghi-anu.


Ma uḅu a, biko, menu ka iru Chineke dajua, ka O we mere ayi amara: ọ bu site n'aka-unu ka nka diworo: Ọ̀ gāhu onye ọ bula nime unu iru-ọma? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri:


Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan