Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 5:12 - Bible Nso

12 N'ihi na amawom na ihe bara uba ka njehie-unu bu, na ihe di ike ka nmehie nile unu bu; unu ndi nākpab͕u onye ezi omume, ndi nānara ihe-nb͕aputa, ma ọ bu umu-ob͕eye di n'ọnu-uzọ-ama-unu ka unu nēwezuga n'ikpe-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba, matakwa ọtụtụ mmehie unu niile. Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị. Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 5:12
39 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha; Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.


Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei, N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama:


Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke chiriworo àkú ahu kpojue àkpà-àkú-ya: Ihere agaghi-eme ha, Mb͕e ha na ndi-iro-ha nēkwurita okwu n'ọnu-uzọ-ama.


asọpuru-kwa-la onye nēnweghi ike n'ise-okwu-ya.


Ewezugala ikpé nke ob͕eye-gi n'ise-okwu-ya.


Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya: Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.


Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu, Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


iwezuga ndi nēnweghi ike n'ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n'ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n'agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n'agha!


bú ndi nēme ka madu mehie site n'okwu-ha, ndi nēsi-kwa-ra onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama ọnyà, we were ihe tọb͕ọrọ n'efu wezuga onye ezi omume.


Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;


ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.


ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya!


Ma Mu onwem, amaram ọlu nile ha na èchìchè nile ha: mb͕e nābia ijikọta mba nile na asusu nile; ha gābia kwa, hu ebubem.


n'ihi na ha emewo ihe-nzuzu n'Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n'aham n'ugha, bú nke M'nēnyeghi ha n'iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu,


N'ihi na unu ji okwu-ugha mebie obi onye ezi omume, ma Mu onwem emeghi ka o b͕ue ya nb͕u; na n'ihi na unu mere ka aka abua nke onye nēmebi iwu di ike, ka o we ghara isi n'uzọ ọjọ ya lata, ime ka ọ di ndu:


Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.


onye obi-ya nwere ume n'etiti ndi-dike gāb͕a ọtọ b͕alaga n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēbipu kwa onye-ikpe n'etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri.


Ha nākpọ onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama asì, ọ bu kwa onye nēkwu okwu n'izu-okè ka ha nākpọ onye-árú.


unu ndi nāb͕anwe ikpé ziri ezi ka ọ ghọ wormwood, ndi nātọb͕ọ kwa ezi omume n'ala;


Nurunu nka, unu ndi nēkusi ume ike ilo ob͕eye, ndi nāchọ kwa ime ka ndi ala-unu ewedara n'ala kwusi,


Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.


Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya:


I gēmere onwe-gi ndi-ikpé na ndi-odozi-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, dika ebo-gi nile si di: ha gēkpe kwa ndi Israel ikpe ezi omume.


O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha.


Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n'ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha.


Unu mara ikpé, unu b͕uru onye ezi omume ahu; ọ dighi-edo onwe-ya imegide unu.


Ma Boaz rigoro rue ọnu-uzọ-ama, nọdu n>ebe ahu: ma, le, onye-nb͕aputa ahu nke Boaz kwuru okwu bayere ya n=agabiga; ọ kpọ aha-ya, si, Wezuga onwe-gi, nọdu ala n>ebe a. O we wezuga onwe-ya, nọdu ala.


Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan