Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 4:2 - Bible Nso

2 Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo idi-nsọ-Ya ṅua iyi, si, na le, ubọchi nābiakwasi unu, mb͕e agāchiri nkò bupu unu, chiri kwa nkò azù bupu ndi-unu fọduru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 4:2
11 Iomraidhean Croise  

Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi; M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;


Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi, Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.


N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia.


Le, M'gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M'gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n'elu ugwu ọ bula, na n'elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha.


M'gētiye kwa nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka azù nke osimiri Nail i nile rapara n'akpirikpa-gi; M'gēme kwa ka i si n'etiti osimiri Nail i nile rigoputa, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile nke nārapara n'akpirikpa-gi.


Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.


M'gēchighari gi, tiye nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka i puta, gi na usu-ndi-agha-gi nile, ma inyinya ma ndi-inyinya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha nile, ọ bu nkpọkọta madu bara uba chiri ọta uku na ọta, ndi nējide mma-agha, ha nile:


Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo Onwe-ya ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta), si: Mu onwem nākpọ npako Jekob ihe-árú, ọ bu kwa ulo-elu-ya nile ka M'kpọworo asì: M'gēmechibido kwa obodo na ùjú-ya nye n'aka onye-iro.


Jehova ejiwo npako Jekob ṅua iyi, si, Agaghm-echezọ ọlu nile ha ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan