Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 3:14 - Bible Nso

14 N'ihi na n'ubọchi M'gēji njehie nile nke Israel leta ya, n'ubọchi ahu ka M'gēji kwa nmehie ebe-ichu-àjà nke Bet-el leta ha, agēbipu kwa mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu, ha ewe da n'ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha, aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel. Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa, mee ka ha daa nʼala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 3:14
15 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, na ebe di elu nke Jeroboam nwa Nebat mere, bú onye mere ka Israel mehie, ọbuná ebe-ichu-àjà ahu na ebe ahu di elu ka ọ kwaturu; o sure ebe ahu di elu ọku, supia ya me ka ọ ghọ uzuzu, sure kwa Ashera ọku.


Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.


Ma ub͕u a, je, duru ndim rue ebe ahu nke M'gwaworo gi okwu bayere ya: le, mọ-ozim ganēje n'iru gi: ma n'ubọchi mb͕e M'nēleta, M'gēwere kwa nmehie-ha leta ha.


ọ bu kwa n'elu uwe anaraworo n'ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n'akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n'ulo Chineke-ha.


Bianu na Bet-el, jehie; bianu na Gilgal, me ka njehie ba uba; chibata-kwa-nu ihe-àjà-unu kwa-ututu, chibata ihe nile bu otù uzọ n'uzọ iri unu kwa ubọchi atọ;


Amazaia, bú onye-nchu-àjà Bet-el, we zigara Jeroboam, bú eze Israel, ozi, si, Emos ekekọtawo madu imegide gi n'etiti ulo Israel: ala apughi inagide okwu-ya nile.


ma ebu-kwa-la amuma ọzọ nime Bet-el: n'ihi na ebe nsọ nke eze ka ọ bu; ọzọ, ulo ala-eze ka ọ bu.


ebe nile di elu nke Aisak gātọb͕ọ kwa n'efu, ebe nsọ nile nke Israel gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe; M'gēji kwa mma-agha bilie imegide ulo Jeroboam.


Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n'akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n'isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M'gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan