Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 1:7 - Bible Nso

7 ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza, ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 1:7
17 Iomraidhean Croise  

Ya onwe-ya tib͕uru ndi Filistia rue Geza na ókè-ala-ya nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.


O we pua, buso ndi Filistia agha, tipúsia mb͕idi Gat, na mb͕idi Jabne, na mb͕idi Ashdod, o we wue obodo n'ala Ashdod na n'etiti ndi Filistia.


Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ndi Filistia, tutu Fero etib͕ue Geza.


Nkwọcha-isi abiakwasiwo Geza; emewo ka Ashkelon dere du, bú ndi ndagwurugwu-ha fọduru: rùe ole mb͕e ka i gēbì onwe-gi mma?


Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tiyesiri ọku n'Ijipt, na mb͕e etijisiri ndi nile nēyere ya aka.


M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Geza, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mere ka otù ndi je biri n'ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n'aka Edom:


M'gēsi kwa n'Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n'Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze; M'gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n'iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.


N'ihi na Geza gābu ebe arapuru arapu, Ashkelon gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: Ashdod, n'etiti-ehihie ka agāchupu ya, agēropu kwa Ekron.


Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.


Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan