Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 1:5 - Bible Nso

5 M'gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n'ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n'ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 1:5
14 Iomraidhean Croise  

Ma okwu Jeroboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, otú o buru agha, otú o weghachi-kwa-ra Damaskọs, na Hemat, nke Juda nwere, nye Israel, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?


Eze Asiria we ge ya nti: eze Asiria we rigorue Damaskọs, were ya, me ka ndi-ya je biri na Kia, o me-kwa-ra ka Rezin nwua.


Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta.


Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.


N'ihi na tutu nwata ahu amara ikpọ, si, Nnam, na, Nnem, agēbulaga àkù Damaskọs na ihe Sameria akwatara n'agha n'iru eze Asiria.


Mma-agha di n'ebe ndi-ekwukwu nọ, ha gāghọ ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha: mma-agha di n'ebe ndi-dike-ya nọ, ha gātu kwa ujọ.


Ndi-dike Babilon arapuwo ibu agha, ha nọduru n'ebe nile ha ewusiri ike; idi-ike-ha alasiwo; ha aghọwo ndinyom: ndi-iro-ha esuyewo ọku n'ebe-obibi-ya nile; etijiwo ihe-ntuchi-ya nile.


Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha: Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi; Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.


Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.


Umu-okorọbia nke Even na Pi-beset gāda site na mma-agha: obodo ndia gāla na ndọta-n'agha.


Agēkpochapu kwa ebe nile di elu nke Even, bú nmehie Israel: ogwu na uke gēpulite n'ebe-ichu-àjà nile ha; ha gāsi kwa ugwu nile, Kpuchienu ayi; ha gāsi kwa ugwu ntà nile, Dakwasinu ayi.


ma unu achọla Bet-el, unu abà-kwa-la na Gilgal, unu agabiga-kwa-la ijeru Bia-sheba: n'ihi na aghaghi ime ka Gilgal je biri n'ala ọzọ, Bet-el gāghọ kwa ajọ ihe.


Ọ̀ bughi ndi di ka umu ndi Etiopia ka unu burum, unu umu Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi Israel ka M'meworo ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, na ndi Filistia site na Kaftoa, na ndi Siria site na Kia?


Le, ndi-gi bu ndinyom n'etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan