Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 1:4 - Bible Nso

4 ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael; ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 1:4
20 Iomraidhean Croise  

Jehova we si ya, Je, laghachi n'uzọ-gi rue ọzara Damaskọs: ma mb͕e i biara, i gēte Hazael manu ibu eze Siria:


Jehoash nwa Jehoahaz we naghachi n'aka Ben-hedad nwa Hazael obodo nile nke ọ nara n'aka Jehoahaz nna-ya n'agha. Ub͕ò atọ ka Joash tib͕uru ya, we weghachi obodo nile nke Israel.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O nye ha n'aka Hazael, bú eze Siria, na n'aka Ben-hedad nwa Hazael, ubọchi nile.


O rue, mb͕e nka gasiri, na Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, rigo, nọchigide Sameria n'agha.


Esa we weputa ọla-ọcha na ọla-edo n'àkù ulo Jehova na nke ulo eze, zigara Ben-hedad, bú eze Siria, onye bi na Damaskọs, si,


Ma ọ buru na unu egeghm nti ido ubọchi-izu-ike nsọ, na ighara ibū ibu bata n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem n'ubọchi-izu-ike; M'gēsuye kwa ọku n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, ọ gērichapu kwa ulo-elu nile nke Jerusalem, agaghi-emenyu kwa ya.


M'gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.


Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tiyesiri ọku n'Ijipt, na mb͕e etijisiri ndi nile nēyere ya aka.


M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M'gēzite ọku n'obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.


ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.


ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.


ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku:


ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile:


ma M'gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n'iti-nkpu agha, na n'olu opì-ike:


ma M'gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem.


ọ bu kwa ihe ọjọ nile nke ndikom Shekem ka Chineke nyeghachiri n'isi-ha: nkọcha Jotam nwa Jerubeal we biakwasi ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan