Mma-agha Jehova juputara n'ọbara, emewo ka ọ ma abuba site n'abuba, site n'ọbara umu-aturu na nkpi, site n'abuba nke akuru ebulu: n'ihi na àjà di Jehova nwere na Bọzra, O nwe-kwa-ra oké ob͕ub͕u n'ala Edom.
Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.
N'ihi na Onwem ka M'jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi.
N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Edom; na èchìchè-Ya nile, nke O chèworo megide ndi bi na Timan, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu; n'ezie o gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.
Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n'iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya?
n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.
Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha.