Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 1:11 - Bible Nso

11 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Edom, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Edọm, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ, o meghị ebere, kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike; nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 1:11
28 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n'ala Ijipt bia, kama ha si n'ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha;


ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n'ibia ichupu ayi n'ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta.


Ndi Edom bia-kwa-ra ọzọ tib͕ue Juda, we dọta ndọta-n'agha n'agha.


Jehova, cheta ubọchi Jerusalem Megide umu Edom; Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ, Rue ntọ-ala di nime ya.


Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe? Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?


Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu.


N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo.


Israel ajusiwo ezi ihe: onye-iro gāchu ya.


Ijipt gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Edom gāghọ kwa ọzara, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi ihe-ike emere umu Juda, n'ihi na ha awusiwo ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ala-ha.


Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.


Ọ bu kwa iwe uku ka Mu onwem nēwesa mba nile ndi nọ jū: n'ihi na Mu onwem were iwe nke-ntà, ma ha onwe-ha yere aka ime ha ihe ọjọ.


Ahuwom unu n'anya, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka I huworo ayi n'anya? Isọ, ọ̀ bughi nwa-nne Jekob? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): otú ọ di, anamahu Jekob n'anya;


Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.


Ya mere burunu ndi nēṅomi Chineke. dika umu ahuru n'anya;


Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan