Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 1:1 - Bible Nso

1 Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 1:1
23 Iomraidhean Croise  

Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu:


O si n'ebe ahu je, chọta Elaisha nwa Shefat, ma onye ahu nēme ka ehi-ya dọghari ihe eji gwu ala ubi, orú ehi na anọ ejikọrọ abua abua di n'iru ya, ya onwe-ya nọye-kwa-ra ehi abua nke-iri-na-abua: Elaija we gabiga jekuru ya, wusara ya uwe-nwuda-ya.


Ndi nile nke Juda we were Azaraia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia.


N'aro nke-iri-na-ise nke Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, ka Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, malitere ibu eze na Sameria ọgu arọ abua na otù.


O wue Bet-lehem, na Itam, na Tekoa,


Ha we bilie n'isi-ututu, pua ba n'ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.


Ma Moses nāzù ìgwè ewu na aturu nke Jetro, bú nna nwunye-ya, bú onye-nchu-àjà Midian: ọ we duru ìgwè ewu na aturu ahu ga n'azu ọzara, ọ we biarue ugwu nke Chineke, rue Horeb.


Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.


Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n'Anatot n'ala Benjamim:


Ndi-amuma ndi burum uzọ, ndi buru kwa gi uzọ, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ha we bue amuma megide ọtutu ala, megide kwa ala-eze uku di iche iche, bayere agha, baye-kwa-ra ihe ọjọ, baye-kwa-ra ajọ ọria nēfe efe.


Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.


I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi.


Okwu Jehova nke ruru Hosea nwa Beeri nti n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel.


Emos we za, si Amazaia, Ọ dighi onye-amuma m'bu, ọ dighi kwa nwa onye-amuma m'bu; kama onye-nche-ehi ka m'bu, ya na onye nēdozi nkpuru osisi sycomore:


Okwu Jehova nke ruru Maika, bú onye Moreshet, nti, n'ubọchi Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, bú okwu nke ọ huru bayere Sameria na Jerusalem.


Unu gēsi kwa na ndagwurugwu ugwum nile b͕alaga; n'ihi na ndagwurugwu ugwu ahu gēru Eze: e, unu gāb͕alaga, dika unu siri n'iru ala-ọma-jijiji b͕alaga n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda: Jehova, bú Chinekem, gābia kwa, ndi nsọ nile gēsoro Gi.


Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.


Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan