Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 9:9 - Bible Nso

9 Di ndu ọṅù, gi na nwunye nke i huru n'anya, ubọchi nile nke ndu ihe-efu-gi, nke O nyeworo gi n'okpuru anyanwu, ubọchi nile nke ihe-efu-gi: n'ihi na nke ahu bu òkè-gi na ndu, na nime ndọb͕u-gi nke gi onwe-gi nādọb͕u onwe-gi n'ọlu n'okpuru anyanwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 9:9
14 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ubọchi ọ nọduru n'ebe ahu di anya, na Abimelek, bú eze ndi Filistia, leputara anya na window, hu, ma le, Aisak na Rebeka, bú nwunye-ya, nēgwu egwú.


Madu yiri otù nku-ume Ubọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.


Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah


Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.


Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu: Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka.


Ma ihe ọ bula anyam abua riọrọ, anapughm ha ihe ahu: eb͕ochighm obim n'ọǹù ọ bula, n'ihi na obim ṅuriri ọṅu site na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu; nka bu kwa òkèm nke sitere na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu.


Ọ dighi ezi ihe di nime madu nke nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ka nkpuru-obi-ya hu ezi ihe nime ndọb͕u nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu. Nka ka mu onwem hu-kwa-ra, na ọ bu n'aka Chineke ka o sitere.


Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu.


M'we hu na ọ dighi ihe di ṅma kari ka madu nāṅuri n'ọlu-ya; n'ihi na nke ahu bu òkè-ya: n'ihi na ònye gēme ka ọ biaghachi ilekwasi ihe gādi mb͕e ọ gasiri?


Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n'ihi na nka bu òkè-ya.


N'ihi na ònye mara ihe diri madu nma na ndu-ya, ọnu-ọgugu ubọchi ndu efu ya nke ọ nēme dika onyinyo? n'ihi na ònye gēgosi madu ihe gādi n'okpuru anyanwu mb͕e ọ gasiri?


Ihe nile a ka m'huworo n'ubọchi nile nke ihe-efum: onye ezi omume di nke nāla n'iyì n'ezi omume-ya, onye nēmebi iwu di kwa nke nēme ka ndu-ya di ogologo n'ihe ọjọ ya.


Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan