Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 9:8 - Bible Nso

8 Ka uwe-gi nile di ọcha mb͕e nile; ka manu-otite nke nēsi ísì utọ ghara kwa ikọnari isi-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 9:8
15 Iomraidhean Croise  

Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu:


Mefiboshet nwa Sọl rida-kwa-ra izute eze; ma o dozighi ukwu-ya, o dozighi kwa afu-ọnu-ya, ọ sughi kwa uwe-ya miri, site n'ubọchi eze jere rue ubọchi mb͕e ọ bia-kwa-ra n'udo.


Mọdekai we si n'iru eze pua n'uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu.


I nēdo table n'usoro n'irum n'anya ndi nākpab͕um: I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè.


Nri anāchọsi ike nke-uku ka m'nērighi, anu na manya-vine abàghi kwa n'ọnum, eteghkwam onwem manu maọli, rue mb͕e ogologo ízù atọ ruzuru.


ndi nāṅu manya-vine n'ọkwa-nwusa, ọ bu kwa manu kachasi nma ka ha ji ete onwe-ha; ma ha ariaghi ọria n'ihi nkpaji akpajiri Josef.


Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi;


I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu.


(Le, anamabia dika onye-ori. Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya, ka ọ ghara ijeghari n'ọtọ, ha we hu ihere-ya.)


Usu nile nke ndi-agha ndi di n'elu-igwe we so Ya n'elu inyinya ọcha, nēyi ezi ákwà ọcha, nke di ọcha nēnwu kwa enwu.


Ewe kweyere ya ka o b͕okwasi onwe-ya ezi ákwà ọcha nēnwu enwu, nke di kwa ọcha: n'ihi na ezi ákwà ọcha ahu bu ezi omume nile nke ndi nsọ.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Sa kwa aru-gi, te manu n>aru gi, b͕okwasi uwe-nb͕okwasi-gi nile n>aru gi, ridarue ebe-nzọcha-ọka: emela ka nwoke ahu mara gi, rue mb͕e o risiri ihe, @nusi kwa ihe-ọ@nu@nu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan