Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 8:4 - Bible Nso

4 N'ihi na okwu eze nwere ike; ònye gāsi kwa ya, Gini ka i nēme?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 8:4
18 Iomraidhean Croise  

Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ, na n'aru ndi-isi usu-ndi-agha. Joab na ndi-isi usu-ndi-agha we si n'iru eze pua igukọta ndi ahu, bú Israel.


n'ezie dika m'were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi n'oche-ezem n'ọnọdum; n'ezie otú a ka m'gēme ta.


Eze, bú Solomon, we zìe ozi n'aka Benaia nwa Jehoiada; o we dakwasi ya, o we nwua.


Eze we nye Benaia nwa Jehoiada iwu; ọ pua, dakwasi ya, ọ we nwua. Ewe me ka ala-eze guzosie ike n'aka Solomon.


Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.


Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu? Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?


Eze Ijipt we kpọ ndinyom ahu nēle ime, ọ si ha, Gini mere unu ji me ihe a, we debe umu-ndikom ndu?


Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu; Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.


Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.


Inyinya-agha; na nkpi; Na eze, nke nbili megide ya nādighi.


Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam?


ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo?


Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan