Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 8:16 - Bible Nso

16 Mb͕e m'were obim nye ima amam-ihe, na ihu nweda-n'ala nke anēme n'elu uwa: (n'ihi na madu di kwa nke nādighi-ahu urá n'anya-ya abua ma ọ bu n'ehihie ma-ọbu n'abali:)

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 8:16
11 Iomraidhean Croise  

Otú a ka m'nọworo; n'ehihie ọkpukpọ-nku ririm, ọtutu-oyi rikwara m n'abali; uram we fepu n'anyam abua.


Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.


M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala.


Ahuwom ọlu nile nke aluworo n'okpuru anyanwu; ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


M'we were obim nye ima amam-ihe, na ima iwi-ara na nzuzu: amawom na nka bu kwa ichọ ijide ifufe.


N'ihi na ubọchi-ya nile bu nání ihe-nb͕u, nkpasu-iwe ka nweda-n'ala-ya bu kwa; ọbuná n'abali obi-ya edinaghi iraru ura. Nka bu kwa ihe-efu.


Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.


Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura.


M'chighariri, mu onwem na obim, ima na iledo, na ichọsi amam-ihe na ichè-èchìchè ike, na ima na nmebi-iwu bu nzuzu, ima kwa na nzuzu bu iwi-ara:


n'ihi na ọ dighi-ama ihe gādi adi; n'ihi na ònye gēgosi ya otú ọ gādi?


Ihe nile a ka m'huworo, m'we nye obim ilu ọlu ọ bula nke aluworo n'okpuru anyanwu: mb͕e di mb͕e otù madu nwere ike n'aru madu-ibe-ya imejọ ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan