Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 8:14 - Bible Nso

14 Ihe-efu di nke anēme n'elu uwa; na ndi ezi omume di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi nēmebi iwu si di; ọzọ, ndi nēmebi iwu di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi ezi omume si di: m'siri na nka bu kwa ihe-efu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 8:14
16 Iomraidhean Croise  

N'ihe a nile Job emehieghi, ọ sighi kwa na Chineke mere ihe-nzuzu.


Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu, Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà?


Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya; N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?


N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo, Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu.


Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ọ di ka ihe emere n'amaghi-ama nke nēsi n'aka onye nāchi achi aputa:


Onye mara ihe, anya-ya abua di n'isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n'ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile.


Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.


Ihe nile a ka m'huworo n'ubọchi nile nke ihe-efum: onye ezi omume di nke nāla n'iyì n'ezi omume-ya, onye nēmebi iwu di kwa nke nēme ka ndu-ya di ogologo n'ihe ọjọ ya.


Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m'gēkwu n'ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n'udo?


Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan