Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 7:5 - Bible Nso

5 Ọ di nma inu ibasi-nba-ike nke onye mara ihe, karia mb͕e madu nānu abù ndi-nzuzu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 7:5
14 Iomraidhean Croise  

Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere; Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi; Ekwela ka isim si, É-è: N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile.


Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem; Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara.


Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya: Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ.


Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti: Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru.


Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọta Kari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.


Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọma Ka onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.


Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n'anya bu: Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu.


N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:


Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì: Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya.


Okwu nile nke ndi mara ihe di ka ndudu eji achu ehi, ọzọ, dika ǹtú akumiri nke-ọma ka okwu nke ndi-nwe nzukọ di, bú okwu enyere site n'aka otù onye-ọzùzù-aturu.


Obi ndi mara ihe di n'ulo oruru-újú; ma obi ndi-nzuzu di n'ulo ọṅù.


Okwu nke ndi mara ihe anēkwu na nwayọ, anānu ha kari iti-nkpu nke onye nāchi achi n'etiti ndi-nzuzu.


Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan