Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 6:2 - Bible Nso

2 madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Chineke na-enye mmadụ akụnụba, na ihe nnweta, na nsọpụrụ, na-emekwa ka ha nwee ihe niile ha chọrọ, ma ọ dịghị enye ha ike ịnụ ụtọ ha; ma onye ọzọ na-anụ ụtọ ha. Nke a bụ ihe efu, bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 6:2
24 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n'etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile.


Jehova we me ka Solomon di uku ri nne n'anya Israel nile, O we tiyekwasi ya ebube ala-eze nke anātukwasighi eze Israel ọ bula nke buru ya uzọ.


O we nwua n'ezi isi-awọ, ubọchi nile nke ndu-ya na àkù na nsọpuru ju-kwa-ra ya afọ: Solomon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


Chineke we si Solomon, N'ihi na nka di n'obi-gi, ma i riọghi àkù, ma-ọbu ihe-nkpakọta, ma-ọbu nsọpuru, ma-ọbu ndu ndi nākpọ gi asì, i riọghi kwa ọtutu ubọchi; kama i riọworo onwe-gi amam-ihe na ihe-ọmuma, ka i we kpe ndim ikpe, bú ndi M'meworo gi eze-ha:


N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova, N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a, Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba: Afọ nēju ha n'umu, Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru.


N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.


Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa: Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.


Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.


Ihe ọjọ nke nēb͕u di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, bú àkù nke onye-nwe-ya nēdebe imejọ onwe-ya:


Nka bu kwa ihe ọjọ nēb͕u nb͕u, na n'ihe nile dika o siri bia, otú a ka ọ gāla: ọ̀ bu kwa ole ihe fọduru ya na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu inwe ifufe?


Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n'ihi na nka bu òkè-ya.


Ọzọ, madu ọ bula nke Chineke nyeworo àkù na ihe-nkpakọta, onye O mewo-kwa-ra ka o nwe ike iri nime ya, na ibūru òkè-ya, na iṅuri ọṅu nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu; nka bu onyinye Chineke.


N'ìhi gini ka unu nātù ego inye n'ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ.


Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ, Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.


Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma:


Ndi ala ọzọ eripiawo ike-ya, ma ya onwe-ya amagh: e, efesawo ya isi-awọ, ma ya onwe-ya amaghi.


Nkpuru ala-ubi-gi na ndọb͕u-n'ọlu-gi nile ka otù ndi nke i nāmaghi gēri; ma i gābu nání onye anēmeb͕u emeb͕u na onye anāzọpia azọpia ubọchi-gi nile:


Ọbìa ahu nke nọ n'etiti gi gārigo n'elu kari gi, nārigo, nārigo; ma gi onwe-gi ganārida ala ala.


Mb͕e unu biara, unu gābiakute ndi nọ na ntukwasi-obi, ala ahu sara mbara n'aka abua: n'ihi na Chineke enyewo ya n'aka-unu; bú ebe nke ọ nādighi ihe ọ bula nke di n'uwa nakọ n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan