Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 6:10 - Bible Nso

10 Ihe nke diworo, ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka akpọrọ aha-ya, amawo kwa na nke ahu bu madu: ọ pughi kwa iluso onye ka ya ike ọ̀gù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga. Amakwaara ihe mmadụ bụ, mmadụ ọbụla apụghị ịlụso onye ka ya ike ọgụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 6:10
18 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke, we kpọ madu ahu òkù, si ya, Òle ebe i nọ?


Gini mere i ji so Ya se okwu, Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?


Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso Onye puru ime ihe nile ọ̀gù? Onye nābara Chineke nba, ya za ya.


N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya, Na ayi gābiakota n'ikpé.


Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di; Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko.


N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


Ihe ọ bula nke diworo, na mb͕e di anya gara aga ka ọ di; ọzọ, ihe ọ bula nke gādi adi, na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo: Chineke nāchọ kwa ihe achupuru achupu.


Ebe ọtutu okwu di nke nēme ka ihe-efu ba uba, gini ka madu nwebigara ókè?


Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka o si n'aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?


Ma-ọbu àyi nākpasu Onye-nwe-ayi ekworo? àyi ka Ya ike?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan