Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 5:6 - Bible Nso

6 Ekwela ka ọnu-gi me anu-aru-gi ka o mehie; asi-kwa-la n'iru onye-ozi Chineke, na ọ bu n'amaghi-ama ka emere ya: n'ìhi gini ka Chineke gēwe iwe megide olu-gi, we mebie ọlu nke aka-gi abua?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 5:6
23 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi ahu Nke nāb͕aputam n'aka ihe ọjọ nile, Ya gọzie umu-okoro ndia; ka akpọ kwa n'isi ha aha nkem, na aha nnam-hà, bú Abraham na Aisak; ka ha ba kwa uba rue ọtutu madu n'etiti uwa.


Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo: Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.


Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.


Amawom na ihe ọ bula Chineke nēme, nke ahu gādiru mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi ihe agātukwasi ya, ọ dighi kwa ihe agēbìlata nime ya: Chineke emewo kwa ya, ka madu we tua egwu n'iru Ya.


Gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e madu gēmehie n'amaghi-ama megide ihe ọ bula nime ihe Jehova nyere n'iwu, si, Emela ha; ọ we me otù nime ha:


Mb͕e onye-isi nēmehie, me kwa ihe n'amaghi-ama megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;


N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.


Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n'irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nzukọ nile nke umu Israel nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha; n'ihi na amaghi-ama ka ọ bu, ha onwe-ha ewetawo kwa nso onyinye-ha iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova, na àjà-nmehie-ha n'iru, Jehova, n'ihi amaghi-ama-ha:


n'ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n'isi-ya, n'ihi ndi-mọ-ozi.


Anamagwasi gi ike n'iru Chineke, na n'iru Kraist Jisus, na n'iru ndi-mọ-ozi arọputara, ka i debe iwu ndia, ghara ima ikpé mb͕e i kānughi, ghara kwa ime ihe ọ bula n'uzọ isọ-anya.


Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?


Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye nēkpere Chineke, mb͕e ọ dighi-akwa ire nke ya nga, kama ọ nāghọ obi-ya aghughọ, okpukpe-Chineke nke onye a bu ihe-efu.


N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga.


Lezienu onwe-unu anya, ka unu we ghara ila ọlu ayi luru n'iyì, kama ka unu we nata ugwọ-ọlu zuru ezù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan