ma-ọbu mb͕e madu gāṅu iyi, nēwere eb͕ub͕ere-ọnu-ya kwu okwu efu ime ihe ọjọ, ma-ọbu ime ezi ihe, ọbuná okwu efu ọ bula madu nēkwu n'iṅu iyi, ma ezonariri ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya bayere otù nime ihe ndia:
N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.
Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n'aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n'ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n'obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke.
Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi.
O rue, mb͕e ọ huru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ewó, adam! i mewo ka m'ruru ala nke-uku, gi onwe-gi adiwo kwa n'etiti ndi nēmekpam aru: ma mu onwem, asaghepuworom Jehova ọnum, apughkwam ilaghachi azu.