5 Onye-nzuzu nākpakọba aka-ya abua, nēri kwa anu-aru onwe-ya.
5 Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.
N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém, Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?
Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu: Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu.
Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá: Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.
Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu: Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.
N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.
Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu? Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?
Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.
O we b͕utue n'aka-nri, ma agu nāgu ya: ọ we rie ihe n'aka-ekpe, ma afọ ejughi ha: ha gēri, onye ọ bula anu-aru nke ogwe-aka-ya: