Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 3:13 - Bible Nso

13 Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 3:13
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n'ọlu inwe ka i gēri: Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma.


Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ, Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?


Ọ dighi ezi ihe di nime madu nke nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ka nkpuru-obi-ya hu ezi ihe nime ndọb͕u nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu. Nka ka mu onwem hu-kwa-ra, na ọ bu n'aka Chineke ka o sitere.


Eledorom n'obim iji manya-vine me ka obi tọ anu-arum utọ, (ma obim nēdum n'amam-ihe), na ijide nzuzu, rue mb͕e m'gāhu ihe ezi ihe ahu bu nke diri umu madu, bú nke ha gēme n'okpuru elu-igwe ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ha.


madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.


Mu onwem we ja ọṅù, n'ihi na ọ dighi ezi ihe madu nwere n'okpuru anyanwu ma-ọbughi iri ihe, na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅuri ọṅu: n'ihi na nke ahu gārapara n'aru-ya nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ubọchi nile nke ndu-ya nke Chineke nyeworo ya n'okpuru anyanwu.


Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.


unu gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n'ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha.


i gāṅuri kwa ọṅu n'ezi ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi, nye kwa ulo-gi, gi onwe-gi, na onye Livai, na ọbìa nke nọ n'etiti gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan