N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
N'ihi na unu nēcheta, umu-nna-ayi, ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu na ihuju-anya-ayi: n'ihi na ayi nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu, ayi we kwusara unu ozi ọma nke Chineke.
ayi erighi kwa nri n'aka onye ọ bula n'efu, kama n'idọb͕u onye-ayi n'ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu: