Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 2:18 - Bible Nso

18 Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọb͕um nile asì, bú nke mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu: n'ihi na m'gārapuru ya madu nke gānọ mb͕e m'gasiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 2:18
19 Iomraidhean Croise  

N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova, N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a, Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba: Afọ nēju ha n'umu, Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru.


N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.


N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu, N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì, We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.


M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala.


Òle ihe fọduru madu nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu n'okpuru anyanwu?


Mu onwem we che ọlum nile nke akam abua luru iru, eche-kwa-ram ndọb͕u nke m'dọb͕uru onwem n'ọlu ime iru: ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe, ọ dighi kwa ihe fọduru madu n'okpuru anyanwu.


N'ihi na madu di nke ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu di n'amam-ihe, na n'ihe-ọmuma, na n'izi-ezi; ma ọ bu madu nke nādọb͕ughi onwe-ya n'ọlu nime ya ka ọ gēnye ya ka ọ buru òkè-ya. Nka bu kwa ihe-efu na ihe ọjọ nke riri nne.


N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


M'we hu na ọ dighi ihe di ṅma kari ka madu nāṅuri n'ọlu-ya; n'ihi na nke ahu bu òkè-ya: n'ihi na ònye gēme ka ọ biaghachi ilekwasi ihe gādi mb͕e ọ gasiri?


e, ọ di nma kari ha abua, bú onye akādighi, nke nāhughi ọlu ọjọ nke aluworo n'okpuru anyanwu.


Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n'ihi na nka bu òkè-ya.


Di ndu ọṅù, gi na nwunye nke i huru n'anya, ubọchi nile nke ndu ihe-efu-gi, nke O nyeworo gi n'okpuru anyanwu, ubọchi nile nke ihe-efu-gi: n'ihi na nke ahu bu òkè-gi na ndu, na nime ndọb͕u-gi nke gi onwe-gi nādọb͕u onwe-gi n'ọlu n'okpuru anyanwu.


Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n'abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n'aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?


Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan