Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 2:14 - Bible Nso

14 Onye mara ihe, anya-ya abua di n'isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n'ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 2:14
16 Iomraidhean Croise  

Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha: Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.


N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu, N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì, We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.


Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi, Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile; Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.


Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.


N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di: Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.


N'ihi na ọ dighi ncheta diri onye mara ihe, dika ọ nēsighi adiri onye-nzuzu, rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na ihe nke di na mb͕e di anya gara aga, n'ubọchi nke nābia ha nile gābu ihe echezọrọ echezọ. Ònye mara ihe si kwa aṅa nwua dika onye-nzuzu?


N'ihi na ihe nādabàra umu madu, ihe nādabà-kwa-ra anumanu; ọbuná otù ihe ahu nādabàra ha: dika ọnwu nke anumanu si di, otú a ka ọnwu nke madu di; e, otù mọ ka ha nile nwere; ọ dighi kwa ọkaka madu nwere kari anumanu: n'ihi na ha nile bu ihe-efu.


e, ọ buru na ọ di ndu nnù arọ abua na ọgu iri okpukpu abua, ma ọ hughi ezi ihe: ọ̀ bughi n'otù ebe ka ha nile nāla?


N'ihi na gini ka onye mara ihe nwebigara ókè kari onye-nzuzu? ma-ọbu gini ka onye ewedara n'ala nwere, bú onye mara ijeghari n'iru ndi di ndu?


Ọ di nma ije n'ulo oruru-újú, kari ije n'ulo ọṅuṅu-manya-vine: n'ihi na nke ahu bu nsọtu madu nile; onye di ndu gētiye kwa ya n'obi-ya.


Ònye di ka onye mara ihe? ònye nāma kwa akukọ-isi okwu? Amam-ihe madu nēnye iru-ya ìhè, ike nke iru-ya nāb͕anwe kwa.


M'laghachiri, hu n'okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile.


Mu onwem we si, Amam-ihe di nma kari idi-ike: ma amam-ihe nke ob͕eye ahu bu ihe anēleda anya, adighi-anu kwa okwu-ya nile.


Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n'ọchichiri ahu, nējeghari kwa nime ọchichiri ahu, ọ mataghi kwa ebe ọ nāga, n'ihi na ọchichiri ahu mere ka anya-ya kpue ìsì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan