Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 12:5 - Bible Nso

5 ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 12:5
19 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.


ma ọ buru na unu ekupu kwa nka n'irum, ajọ ihe adakwasi kwa ya, unu gēweda isi-awọm rue ala-mọ n'ihe ọjọ.


o gēru kwa, mb͕e ọ huru na nwa-okoro ahu esoghi ayi bia, na ọ gānwu: ndi-orù-gi gēweda kwa isi-awọ orù-gi, bú nna-ayi, rue ala-mọ na nwuta.


Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi, Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.


Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm; Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri;


N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.


Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.


Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu, N'uzọ ezi omume ka agāhu ya.


Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu: Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa.


Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n'aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n'aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu.


Okwu Jehova we ruem nti, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Jeremaia? M'we si, Nkpa-n'aka nke osisi almond ka m'nāhu.


M'gāchusa kwa ha n'etiti mba nile, ndi ha nāmaghi, ma ha onwe-ha ma ndi bu nna-ha: M'gēziso ha mma-agha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia.


I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.


Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan