Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 12:3 - Bible Nso

3 n'ubọchi ahu mb͕e ndi nēdebe ulo gāma jijiji, mb͕e ndi bu dìnkpà gērulata onwe-ha, mb͕e ndinyom nke nēgwe nri gākwusi n'ihi na ha di ole-na-ole, mb͕e agēme ka anya b͕achie ndinyom nēsi na window elepu anya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji, mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata, mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole, mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 12:3
9 Iomraidhean Croise  

I O rue, mb͕e Aisak ghọrọ agadi, mb͕e anya-ya abua nāhu kwa inyogho-inyogho, nke mere ka ọ ghara ihu uzọ, na ọ kpọrọ Isọ, bú nwa-ya nke-okenye, si ya, Nwam: ọ si ya, Lekwam.


Ma anya Israel di arọ́ site n'agadi ọ bu, ọ pughi ihu uzọ. O me ka ha biakute ya nso; o we sutu ha ọnu, b͕akua ha.


O wedawo ikem n'uzọ; O bilatawo ubọchim nile.


Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri: Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.


Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku; Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agadi ndikom na agadi ndinyom gānọdu ala ọzọ n'amá nile nke Jerusalem, onye ọ bula o jide nkpa-n'aka-ya n'aka-ya site n'iba-uba nke ubọchi ndu-ya.


O rue, n'ubọchi ahu, mb͕e Ilai nēdina ala n'ebe-ya, (ma anya-ya malitere ihu inyoghi-inyoghi, na ọ pughi ihu uzọ,)


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan