Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 12:10 - Bible Nso

10 Onye-nkpọkọta chọrọ ichọputa okwu nile nātọ utọ, na ihe edeziri edezi, bú okwu nile nke ezi-okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 12:10
14 Iomraidhean Croise  

Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume mara ihe nātọ utọ: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu.


Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!


Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu: Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.


Okwu nke Onye-nkpọkọta, bú nwa Devid, bú eze nime Jerusalem.


Mu onwem, bú Onye-nkpọkọta, abuwo eze Israel nime Jerusalem.


N'ezie, n'ezie, asim i, Ayi nēkwu ihe ayi matara, ayi nāb͕a kwa àmà ihe ayi huru; ma unu anaraghi àmà-ayi.


n'ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n'elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n'okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma,


Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan