Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 11:8 - Bible Nso

8 E, ọ buru na madu adi ndu ọtutu arọ, ya ṅuria nime ha nile; ma ya cheta ubọchi nile nke ọchichiri, n'ihi na ha gāba uba. Ihe nile nke nābia bu ihe-efu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa nʼime ihe niile, ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị ga-adị ọtụtụ. Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 11:8
32 Iomraidhean Croise  

Tutu alam, ghara kwa ilaghachi, Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;


Ala oké ọchichiri, dika oké ọchichiri onwe-ya; Ala onyinyo ọnwu, nke usoro nādighi ya, Ebe ọmumu-ìhè di kwa ka oké ọchichiri.


Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya: Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?


Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa: Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta, Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha.


Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di? Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:


Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri, Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.


Madu nke nọ na nsọpuru, ma ọ dighi-aghọta ihe, Yiri anu emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.


Nye asa òkè, e, nye kwa asatọ; n'ihi na i maghi ihe ọjọ di aṅa gādi n'uwa.


Mu onwem we si n'obim, Dika o si dabàra onye-nzuzu, otú a ka ọ nādabàram, ọbuná mu onwem; ma n'ìhi gini kwa ka mu onwem mara ihe kari? M'we kwue okwu n'obim, si, na nka bu kwa ihe-efu.


M'we kpọ ndu asì; n'ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbu onye-nzuzu? ma ọ gāchi ndọb͕um nile nke m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, na nke m'meworo n'amam-ihe n'okpuru anyanwu. Nka bu kwa ihe-efu.


N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Ọ dighi nguta diri ndi-ya nile, bú ndi nile ọ di n'iru ha: ma ndi gādi n'ọdi-n'iru agaghi-aṅuri nime ya. N'ezie nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.


Ebe ọtutu okwu di nke nēme ka ihe-efu ba uba, gini ka madu nwebigara ókè?


e, ọ buru na ọ di ndu nnù arọ abua na ọgu iri okpukpu abua, ma ọ hughi ezi ihe: ọ̀ bughi n'otù ebe ka ha nile nāla?


N'ubọchi ọdi-nma-gi nọ n'ọdi-nma, ma n'ubọchi ọdi-njọ le anya: ọbuná otù na nso ibe-ya ka Chineke meworo ha, ka madu we ghara ichọputa ihe ọ bula nke gādi mb͕e ọ gasiri.


Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n'ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n'iru Ya:


Mu onwem we ja ọṅù, n'ihi na ọ dighi ezi ihe madu nwere n'okpuru anyanwu ma-ọbughi iri ihe, na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅuri ọṅu: n'ihi na nke ahu gārapara n'aru-ya nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ubọchi nile nke ndu-ya nke Chineke nyeworo ya n'okpuru anyanwu.


Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.


Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.


ọ bu ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, dika chi-ọbubọ nke bọsaworo n'elu ugwu nile; otù ndi nābia di ọtutu nwe kwa ume, ihe di ka ha adighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, mb͕e ha gasiri ihe di ka ha agaghi-adi ọzọ, rue arọ nile nke ọb͕ọ na ọb͕ọ.


Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n'ọchichiri nke èzí; n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.


Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka, Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!


na ha siri unu, N'oge ikpe-azu ndi-ọchì gādi, nāga dika agu ihe ọjọ nile nke aka ha nke asọpughi-Chineke si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan