Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 11:5 - Bible Nso

5 Dika i nēsighi ma ihe bu uzọ ifufe, ma-ọbu otú ọkpukpu nile si etó n'afọ nwanyi di ime; ọbuná otú a i dighi-ama ọlu Chineke Nke nēme ha nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 11:5
19 Iomraidhean Croise  

Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike: N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala.


Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa? Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.


Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi; Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:


Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova! N'amam-ihe ka I meworo ha nile: Uwa juputara n'ihe I nwetara.


Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile, Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ: Apughi idoro Gi ha n'usoro; Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha, Ha kariri igu-ọnu.


Le ka ọlu-Gi nile si di uku, Jehova! Èchìchè-Gi miri emi nke-uku.


M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala.


Ifufe nēferu Ndida, we nēfe buruburu rue Ugwu; ọ nēfe buruburu mb͕e nile na nfeghari-ya, ọ bu kwa n'ife buruburu ya ka ifufe feghachiworo.


Onye nāriba ifufe ama agaghi-agha nkpuru; ọzọ, onye nēlekwasi igwe-oji anya agaghi-ewe ihe-ubi.


Ahuwom nweda-n'ala nke Chineke nyeworo umu madu iweda ha n'ala nime ya.


Ihe nile ọ bula ka O meworo ka ọ ma nma na mb͕e-ya: ọzọ, mb͕e ebighi-ebi ka O tiyeworo n'obi-ha, ma ka O si tiye ya madu agaghi-achọputa ọlu ahu nke Chineke luworo site na nmalite we rue na nsọtu.


Ọ di anya, bú ihe nke diworo, o mi-kwa-ra emi nke-uku; ònye gāchọputa ya?


m'we hu ọlu nile nke Chineke, na madu apughi ichọputa ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ọ buru na madu adọb͕u onwe-ya n'ọlu n'uzọ nile ichọ ya, ma ọ gaghi-achọputa ya; ọzọ kwa, ọ buru na onye mara ihe asi na ọ gāma ya, ọ pughi ichọputa ya.


Ì maghi? ì nughi? Chineke nke mb͕e ebighi-ebi ka Jehova, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ dighi-ada #mbà, ike adighi-agwu kwa Ya; ọ dighi ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya.


Ifufe nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i mataghi ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di.


A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! le otú anēnweghi ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnweghi kwa ike ituputa uzọ-Ya nile!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan