Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 10:19 - Bible Nso

19 N'ihi ichì-ọchì ka anēsi nri, manya-vine nēme ka ndu ṅuria: ego nāza kwa ihe nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị, mmanya na-enye obi ụtọ, ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 10:19
33 Iomraidhean Croise  

Ewe si n'iru ya butere ha onyinye nri: ma onyinye nri Benjamin kariri onyinye nri ha nile ub͕o ise. Ha we so ya ṅu ihe-ọṅuṅu, we ṅujue afọ.


Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m'si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà.


Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n'ego zuru ezu o ruru: n'ihi na m'gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m'gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula.


Ndi nile nke nọ ha buruburu we were ihe ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo na ihe di oké ọnu-ahia, nāgughi ihe nile enyere n'afọ-ofufo, me ka aka-ha di ike.


M'we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza.


N'ubọchi nke-asa, mb͕e obi eze di nma site na manya-vine, ọ siri Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, bú ndi-onozi asa ndi nēje ozi n'iru eze, bú Ahasuerọs,


Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria, Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu, Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi.


Ọ ghasawo àkù-ya, o nyewo ndi-ob͕eye ihe; Ezi omume-ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi: Agēwere nsọpuru me ka mpi-ya di elu.


Eledorom n'obim iji manya-vine me ka obi tọ anu-arum utọ, (ma obim nēdum n'amam-ihe), na ijide nzuzu, rue mb͕e m'gāhu ihe ezi ihe ahu bu nke diri umu madu, bú nke ha gēme n'okpuru elu-igwe ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ha.


Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.


Urù-ahia-ya na onyinye-ikwa-iko-ya gāghọ kwa ihe nsọ Jehova nwere: agaghi-edebe ya n'ulo-àkù, agaghi-ebukọba kwa ya; n'ihi na ndi bi n'iru Jehova gēnwe urù-ahia-ya, iriju afọ, na inwe ákwà-nb͕okwasi nādigide adigide.


Iti-nkpu di n'èzí nile n'ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n'ala ọzọ.


Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.


Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.


M'gāsi kwa nkpuru-obim, Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāṅu ihe-ọṅuṅu, ka obi nātọ gi utọ.


Mu onwem nāsi kwa unu, Menu ndi-eyi nye onwe-unu site n'àkù nke ajọ omume; ka, mb͕e ọ bula ọ gāgwu, ka ha we kpọbata unu n'ulo-ikwū ebighi-ebi.


na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.


Ndi nēso uzọ Jisus, onye ọ bula ka ihe o nwere ra, we zube izigara umu-nna nime Kraist ndi bi na Judia ihe iyere ha aka:


ha we re ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, we kesa ha nye madu nile, dika nkpà diri onye ọ bula.


N'ihi na oge nke gasiworo ezuwo iluputa ihe ndi mba ọzọ nēzube, na ijeghari nime agu ikwa-iko, agu ihe ọjọ nile, manya-ob͕ub͕u nile, ite-egwú nile, iṅubiga-manya-ókè nile, na ikpere-arusi nile jọb͕uru onwe-ha:


Nna-ya we ridakuru nwayi ahu: Samson we me oké oriri n'ebe ahu; n'ihi na otú a ka umu-okorọbia nēme.


Osisi vine we si ha, M'gāgha manya ọhu nkem, bú nke nēme ka Chineke na madu ṅuria ọṅu, je ifeghari n'elu osisi nile?


Abigail we biakute Nebal; ma, le, o nwere oké oriri n'ulo-ya, dika oké oriri eze; obi Nebal we di nma nime ya, ọ ṅubiga-kwa-ra manya okè nke-uku: Abigail we ghara igosi ya okwu ọ bula, okwu ntà ma-ọbu okwu uku, rue ìhè ututu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan