Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ekiliziastis 10:13 - Bible Nso

13 Nmalite okwu nile nke ọnu-ya bu nzuzu: nkwubì okwu-ọnu-ya bu kwa iwi-ara ọjọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu, ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ekiliziastis 10:13
25 Iomraidhean Croise  

Ma, le, ndikom nile nke Israel nābiakute eze, we si eze, Gini mere umu-nne-ayi, bú ndikom Juda, zupuru gi n'ori, me ka eze na ulo-ya gabiga Jọdan, na ndikom Devid nile tiyere ya?


Ọ si, Ọ buru na Jehova azọputaghi gi, òle ebe m'gēsi zọputa gi? ọ̀ bu site n'ebe-nzọcha-ọka, ma-ọbu site n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine?


O we si, Ka Chineke mem otú a, ka O me kwa ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na isi Elaisha nwa Shefat gēguzo n'aru ya ta.


Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu: Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe, Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.


Onye-nzuzu nēme kwa ka okwu ba uba: madu adighi-ama ihe ọ bula nke gādi adi; ọzọ, ihe gādi mb͕e ọ gasiri, ònye gēgosi ya?


Ekwela ka ọnu-gi kwue okwu ọsọsọ, eme-kwa-la ka obi-gi me ngwa iweputa okwu n'iru Chineke; n'ihi na Chineke nọ n'elu-igwe, ma gi onwe-gi nọ n'elu-uwa: n'ihi nka me ka okwu-gi di ole-na-ole.


M'chighariri, mu onwem na obim, ima na iledo, na ichọsi amam-ihe na ichè-èchìchè ike, na ima na nmebi-iwu bu nzuzu, ima kwa na nzuzu bu iwi-ara:


Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe.


Ma mb͕e onye-Farisi ahu huru ihe Ọ nēme, o ju ya anya na O bughi uzọ kwo aka-Ya mb͕e Ọ gaje iri nri-ututu.


Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.


Ma ufọdu nime ndi-Farisi siri, Gini mere unu nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike?


Ma ndi-isi-nchu-àjà b͕ara ìzù ka ha we b͕u kwa Lazarọs;


O rue, n'ubọchi nke-asa, na ha siri nwunye Samson, Rà di-gi ọnu, ka o we gosi ayi ilu ahu, ka ayi we ghara isure gi na ulo nna-gi n'ọku: ọ̀ bu inapu ayi ihe nile ayi nwere ka unu kpọrọ ayi? ọ̀ bughi otú a?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan