Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 9:4 - Bible Nso

4 Ekwula n'obi-gi, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, kwapusiri ha n'iru gi, si, N'ihi ezi omumem ka Jehova mere ka m'bata inweta ala nka: ma ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova nānapu ha ala-ha n'iru gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 9:4
20 Iomraidhean Croise  

Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi.


N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, unu ulo Israel, kama ọ bu n'ihi aha nsọm, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile ebe unu biara.


Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), maranu nka: ka ihere uzọ nile unu me unu, ka etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere, unu ulo Israel.


Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha.


Ọ di nma; n'ekweghi-ekwe-ha ka anyakapuru ha, ma gi onwe-gi nēguzo n'okwukwe-gi. Atukwasila uche-gi n'ihe di elu, kama nātu egwu:


Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a.


N'ihi na ọ dighi ihe ọ bula m'mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n'onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi.


N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?


Emerela Jehova, bú Chineke-gi, otú a: n'ihi na ihe-árú nile nke Jehova, nke Ọ nākpọ asì, ka ha meworo chi-ha; n'ihi na ọbuná umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha nēsurere chi-ha n'ọku.


N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?


i we si n'obi-gi, Ikem na ume akam emetaworom àkù a.


Ndi nānupu isi ka unu bu n'ebe Jehova nọ site n'ubọchi m'mara unu.


Ọ bughi n'ihi ezi omume-gi, ma-ọbu n'ihi nziri-ezi nke obi-gi, ka gi onwe-gi nābà inweta ala-ha: kama ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi, ka Ọ we me kwa ka okwu ahu guzosie ike nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.


Cheta, echezọla, ihe nke i ji kpasu Jehova, bú Chineke-gi, iwe n'ọzara: site n'ubọchi mb͕e i si n'ala Ijipt puta, rue mb͕e unu biaruru ebe a, ndi nānupu isi ka unu buworo n'ebe Jehova nọ.


Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan