Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 9:15 - Bible Nso

15 M'we chigharia, si n'ugwu ahu rida, ugwu ahu nēre kwa ọku: mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu di kwa n'elu akam abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 9:15
7 Iomraidhean Croise  

Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n'ihi na Jehova ridakwasiri ya n'ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku.


Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'iru elu-igwe: Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na ákú-miri-ígwé, ọku we nējeru ala; Jehova we me ka ákú-miri-ígwé zokwasi ala Ijipt.


Unu we biaru nso, guzo n'okpuru ugwu ahu; ugwu ahu nēre ọku rue obi elu-igwe, n'ọchichiri, na igwe-oji, na oké ọchichiri.


O rue, mb͕e unu nuru olu ahu site n'etiti ọchichiri ahu na ugwu ahu nēre ọku, na unu biarurum nso, bú ndi-isi nile nke ebo nile unu, na ndi-okenye-unu;


M'we hu, ma, le, unu emehiewo megide Jehova, bú Chineke-unu; unu emeworo onwe-unu nwa-ehi awuru awu: unu esiwo n'uzọ nke Jehova nyere unu n'iwu wezuga onwe-unu ngwa ngwa.


N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan