Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 9:12 - Bible Nso

12 Jehova we sim, Bilie, si n'ebe a rida ngwa ngwa; n'ihi na ndi-gi, nke i meworo ka ha si n'Ijipt puta, ebibiwo onwe-ha; ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa; ha emeworo onwe-ha nwa-ehi awuru awu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 9:12
16 Iomraidhean Croise  

Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha: Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ.


Moses we si ndi Israel, Cheta ubọchi a, nke ọ bu nime ya ka unu siworo n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta; n'ihi na ike nke aka ka Jehova ji me ka unu si n'ebe a puta: agaghi-eri kwa achicha koro eko.


Ndi Israel we hu na Moses nọrọ ọdù isi n'ugwu ahu ridata, ndi ahu we kpọkọta onwe-ha n'ebe Eron nọ, si ya, Bilie, mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi; n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.


Gini ka M'gēme gi, Efraim? gini ka M'gēme gi, Juda? n'ihi na ebere-unu di ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu.


Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche;


N'ihi na amawom na mb͕e ọnwum gasiri unu gēbibi onwe-unu nke-uku, wezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke m'nyeworo unu n'iwu; ihe ọjọ gādakwasi kwa unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia; n'ihi na unu gēme ihe ọjọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe n'omume aka-unu.


Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu. Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ.


ka unu we ghara ibibi onwe-unu, we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi nke oyiyi-ihe, ihe-atù nke oké ma-ọbu nwunye,


I gēcheta kwa na i buri orù n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, were aka di ike, were kwa ogwe-aka eseteri eseti, me ka i si n'ebe ahu puta: n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu idebe ubọchi-izu-ike.


M'we hu, ma, le, unu emehiewo megide Jehova, bú Chineke-unu; unu emeworo onwe-unu nwa-ehi awuru awu: unu esiwo n'uzọ nke Jehova nyere unu n'iwu wezuga onwe-unu ngwa ngwa.


M'we kpere Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, ebibila ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, nke I b͕aputaworo n'idi-uku-Gi, nke I wereworo aka di ike me ka o si n'Ijipt puta.


Ma ha onwe-ha bu ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, ndi I were ike uku Gi na ogwe-aka-Gi eseteri eseti me ka ha puta.


Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n'ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha.


Ọzọ kwa, ha egeghi nti ndi-ikpé-ha, n'ihi na ha soro chi ọzọ nākwa iko, we kpọ isi ala nye ha: ha siri n'uzọ ahu wezuga onwe-ha ngwa, bú nke ndi bu nna-ha jere nime ya, n'inu ihe nile Jehova nyere n'iwu; ma ha emeghi otú a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan