4 Uwe-nb͕okwasi-gi akapughi nká n'aru gi, ukwu-gi azaghi kwa aza, ọgu arọ abua ndia.
4 Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.
Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n'ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.
Umu Israel we rie manna ahu ọgu arọ abua, rue mb͕e ha batara n'ala ebí ebí; manna ahu ka ha riri, rue mb͕e ha batara na nsọtu ala Kenean.
Umu-unu gābu kwa ndi-ọzùzù-aturu n'ọzara ọgu arọ abua, ha gēbu kwa ọkwukwa-iko nile unu, rue mb͕e ozu-unu gāgwusi n'ọzara.
N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n'omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n'ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi.
Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n'ọzara: uwe-unu akapughi nká n'aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n'ukwu-gi.