N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu, Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha: Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi, N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.
M'laghachiri, hu n'okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile.
Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n'ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n'ọhia, na dika nju-aka ọka n'azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.
N'ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n'anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n'ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi.
N'ihi nka ka ọ nāchuru eriri-ya àjà, nēsurere ub͕u-ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; n'ihi na site na ha ka òkè-ya nwere urù, ihe-oriri-ya ma-kwa-ra abuba.
N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?
Ekwula n'obi-gi, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, kwapusiri ha n'iru gi, si, N'ihi ezi omumem ka Jehova mere ka m'bata inweta ala nka: ma ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova nānapu ha ala-ha n'iru gi.
Devid we si, Umu-nnem, ihe Jehova nyere ayi, bú Onye debere ayi, nye kwa n'aka-ayi usu ahu ndi nāpunara madu ihe, ndi biara imegide ayi, unu agaghi-ewere ihe ahu me otú a.