Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 8:15 - Bible Nso

15 Onye nēme ka i je ije n'ọzara uku ahu nke di egwu, nke agwọ nke yiri ọku na akpi di nime ya, na ala akpiri-ikpọ-nku nke miri nādighi ya; Onye nēme ka miri si n'oké nkume ọmu ahu putara gi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Onye duuru gị nʼime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara, ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị. O sitere na nkume nye gị mmiri ọṅụṅụ

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 8:15
16 Iomraidhean Croise  

O meghere oké nkume, miri we rùputa; Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri.


Onye b͕anwere oké nkume ka ọ ghọ ọdọ-miri juputara na miri, B͕anwe ọmú ka ọ ghọ isi-iyi miri.


Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.


Ibu eboro anumanu nile nke Negeb. N'ala ahuhu na nkpà, ebe nne-ọdum na oke-ọdum na aju-ala na agwọ yiri ọku nēfe efe si abia, ka ha nēbu àkù-ha nile n'ubu umu-inyinya-ibu, na ihe-ha nile di oké ọnu-ahia n'okpu-azu camel, ijekuru otù ndi nāgaghi-abara ha urù.


Mirage gāghọ kwa ọdọ-miri, ala miri nādighi gāghọ kwa isi-iyi juputara na miri: n'ebe-obibi nkita-ọhia, ebe ha nāmakpu amakpu, ogige nke diri amì na papyrus.


Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M'gēme ka uzọ di n'ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n'ala tọb͕ọrọ n'efu.


Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n'ọzara, n'ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n'ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n'ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n'ebe ahu?


Mu onwem mara gi n'ọzara, n'ala kpọrọ oké nku.


Moses we welie aka-ya were nkpa-n'aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha.


Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n'etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n'Israel.


ha nile ṅu-kwa-ra otù ihe-ọṅuṅu ahu nke mọ: n'ihi na ha nāṅu miri nke si na nkume nke mọ nke soro ha: nkume ahu bu kwa Kraist.


Ayi we si na Horeb bulie ije, we je ije nime ọzara uku ahu di egwu nke unu huru, n'uzọ ugwu ndi-Amorait, dika Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu; ayi we biarue Kedesh-banea.


Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya, Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi; O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu, Na manu site n'oké nkume ọ́mú;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan