Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 8:11 - Bible Nso

11 Lezie onwe-gi anya ka i ghara ichezọ Jehova, bú Chineke-gi, n'edebeghi ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ma lezie anya ka ị ghara ichefu Onyenwe anyị Chineke gị, na-edebeghị iwu ya niile, na ikpe ya niile, na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 8:11
19 Iomraidhean Croise  

Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:


Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha, Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt;


N'ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha, Ọ bu kwa inọ-n'udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n'iyì.


Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.


i we chezọ Jehova Onye meworo gi, Onye nēseti elu-igwe, tọ kwa ntọ-ala uwa: i we tua oké egwu mb͕e nile ogologo ubọchi nile n'ihi ọnuma nke onye-nkpab͕u, mb͕e o doziri àkú ibibi? ma òle ebe ọnuma nke onye-nkpab͕u ahu di?


Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n'otù n'otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal.


ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:


Chetanu iwu Moses, bú orùm, nke M'nyere ya n'iwu na Horeb inye Israel nile, bú ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche.


ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n'iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko:


Unu gēlezi kwa anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke mu onwem nētiye n'iru unu ta.


Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu.


Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.


Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;


na ulo juputara n'ezi ihe nile, nke i nēmejughi, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, nke i nēgwuwaghi, na ubi-vine na osisi olive, nke i nākughi, mb͕e i gēri kwa, afọ eju kwa gi;


I gēdebe kwa ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ha.


na obi-gi gādi elu, i we chezọ Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta;


Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, chezọ Jehova, bú Chineke-ha, fè Bealim na Asherot.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan