Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 7:26 - Bible Nso

26 eme-kwa-la ka ihe-árú ba n'ulo-gi, i we ghọ ihe ewezugara ka ebibie ya dika ya: i gājusi ya aju, kpọ kwa ya ihe rusiri árú; n'ihi na ihe ewezugara ka ebibie ya ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Unu ewebatala ihe arụ ọbụla nʼụlọ unu, ka unu ghara ịbụ ihe e debere iche nye mbibi dịka ya. Kpọọnụ ihe arụ ahụ asị, ledakwanụ ya anya, nʼihi na ihe e debere iche nye mbibi ka ọ bụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 7:26
15 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi ahu madu gētufu ihe-efu-ya nile nke ọla-ọcha, na ihe-efu-ya nile nke ọla-edo, nke ha mere ka ọ we kpọ isi ala nye ha, ọ gētufu ha nye anu mole na usu;


Unu gēmeru kwa ihe amachitara arusi ọla-ọcha gi nile apiri api, na ihe awuchitara arusi ọla-edo gi awuru awu: i gātusa ha dika ihe ruru inyi; i gāsi ya, Pua.


Le, unu onwe-unu sitere n'ihe nābughi ihe, ọlu-unu site-kwa-ra n'ihe-efu: ihe-árú ka onye nārọputa unu bu.


Ha gābà kwa n'ebe ahu, ha gēsi kwa na ya wezuga ihe-ya nile jọb͕uru onwe-ha, na ihe-árú-ya nile.


N'ihi na onye ọ bula n'ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēkewapu onwe-ya n'isom, we me ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n'aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n'Onwem:


Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M'gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi.


Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.


gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori?


I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.


Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;


mb͕e i gēge kwa olu Jehova, bú Chineke-gi, nti, idebe ihe nile Ọ nyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan