Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 7:13 - Bible Nso

13 Ọ gāhu kwa gi n'anya, gọzie gi, me ka i ba uba: Ọ gāgọzi kwa nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-gi, bú ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, n'elu ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 7:13
26 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n'iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n'ubọchi ndi-eze Asiria rue ta.


Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala.


Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.


Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.


Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku; Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.


N'ihi na onye ezi omume ka Jehova bu; ezi omume ka Ọ huru n'anya: Ndi ziri ezi gāhu iru-ya.


Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu: Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.


Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì; Jehova nēkuli ndi nēruda n'ala; Jehova n'ahu ndi ezi omume n'anya;


Ma unu gēfè Jehova, bú Chineke-unu, Ọ gāgọzi kwa nri-gi na miri-gi; M'gēwe-zuga kwa ọria n'etiti gi.


Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.


Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu: Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya.


M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.


Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.


Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.


Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya.


n'ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n'anya, n'ihi na unu onwe-unu huworom n'anya, kwere kwa na Mu onwem siri n'ebe Nnam nọ puta.


Le, edowom ala ahu n'iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha.


Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;


Ọ gēru kwa, ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu nke Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, na Jehova, bú Chineke-gi, gēme gi ka i kachasia mba nile nke uwa elu:


Jehova gēme kwa ka i babiga uba okè bayere ezi ihe, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.


Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i ba n'ala ahu nke nna-gi-hà nwetara, i gēnweta kwa ya; Ọ gēme kwa gi nma, me kwa ka i ba uba kari nna-gi-hà.


Ọ bughi na unu bara uba kari ndi nile ka Jehova huru unu n'anya si-ike, we rọputa unu; n'ihi na unu onwe-unu di ole-na-ole kari ndi nile ọzọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan