N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.
N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gētiye iwum n'ime-ha, ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ya dika n'akwukwọ; M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:
ebe emere ka unu puta ìhè na unu bu akwukwọ-ozi Kraist, nke ayi jere ozi ya, nke anējighi ink de, kama ọ bu Mọ nke Chineke di ndu ka eji de ya; ọ bughi n'elu mbadamba nkume, kama ọ bu n'elu mbadamba ihe di iche, bú obi nke anu-aru.
Unu gēdo kwa okwu ndia n'obi-unu na nime nkpuru-obi-unu; unu gēke kwa ha n'elu aka-unu ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-unu.
Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.