Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 6:3 - Bible Nso

3 I gānu kwa, Israel, lezi kwa anya ime ya; ka o we diri gi nma, ka unu we ba kwa uba nke-uku, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu, n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 6:3
25 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M'gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi:


M'gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi.


O me ka ọ puta n'èzí, Ọ si, Biko, legide anya n'ebe elu-igwe di, gua kpakpando, ọ buru na i puru igu ha: Ọ si ya, Otú a ka nkpuru-gi gādi.


na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya;


M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;


nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi.


Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu, Ka ayi we debesie ha ike.


Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha.


M'we si, M'gēme ka unu si na nweda-n'ala nke Ijipt rigorue ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Perizait na ndi-Haivait na ndi Jebus, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya.


Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n'ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya.


M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.


Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n'ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n'iru Ya:


Sinu onye ezi omume, na ọ gādiri ya nma: n'ihi na nkpuru omume-ha nile ka ha gēri.


Ma ọ di nma ma ọ jọrọ njọ, olu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēge nti, bú Onye ayi onwe-ayi nēziga gi ijekuru; ka o we diri ayi nma, mb͕e ayi nēge nti olu Jehova, bú Chineke-ayi.


kama ọ bu okwu a ka M'nyere ha n'iwu, si, Genu nti olum, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n'uzọ nile nke M'nēnye unu n'iwu, ka o we diri unu nma.


Ma mb͕e oge nkwa ahu nēru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndi-Ju gara n'iru ba kwa uba n'Ijipt,


ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, inye kwa nkpuru-ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù erù nime ya.


Si n'ebe-obibi nsọ Gi, si n'elu-igwe, le anya, gọzie ndi-Gi, bú Israel, na ala-ubi ahu nke I nyeworo ayi, dika I ṅuru nna-ayi-hà iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.


O we me ka ayi bata n'ebe a, O we nye ayi ala nka, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.


i gēdekwasi kwa ha okwu nile nke iwu a, mb͕e i gabigasiri; ka i we ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, dika Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu.


N'ihi na mb͕e M'gēmewori ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya; mb͕e ha gēriwo-kwa-ri ihe, afọ eju kwa ha, ha we ma abuba; ha gēche kwa chi ọzọ iru, fè ha òfùfè, we leliam anya, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum.


I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.


Debe-kwa-nu ha, me kwa ha; n'ihi na nka bu amam-ihe-unu na nghọta-unu n'anya ndi nile, ndi gānu ukpuru ndia nile, we si, Otú ọ di, ndi mara ihe na ndi nwere nghọta ka mba uku a bu.


ala nke ọka wheat na ọka barley, na osisi vine, na osisi fig, na pomegranate; ala nke osisi olive nēnye manu, na nke manu-aṅu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan